Ezekiel 45

Okike a ga-eke ala ahụ

1“ ‘Mgbe unu ga-eke ala ahụ dịka ihe nketa, unu ga-ebu ụzọ nye Onyenwe anyị otu oke nʼime ya ka ọ bụrụ oke dị nsọ nke ala ahụ. Ogologo ya ga-adị kilomita iri na atọ, obosara ya ga-abụ kilomita iri na otu. Ihe dị nsọ ka ala ahụ niile ga-abụ gbaa gburugburu. 2Site nʼala, otu akụkụ dị narị mita abụọ na iri itoolu na otu, na iri sentimita asaa na ise, ga-abụ maka ebe nsọ. A ga-ahapụ ala dị iri mita abụọ na itoolu gburugburu ya. 3Site nʼoke ebe ahụ dị nsọ, tụpụta oke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, obosara ya kilomita ise na ọkara. Ọ bụ nʼime ya ka ebe nsọ, ya bụ Ebe ahụ Kachasị Nsọ ga-adị. 4Ọ ga-abụ oke ala ndị nchụaja, ndị na-eje ozi nʼebe nsọ, na ndị na-abịa nso ije ozi nʼihu Onyenwe anyị. Ọ ga-abụkwa ebe ụlọ obibi ha ga-adị, bụrụkwa ebe dị nsọ maka ebe nsọ ahụ. 5Ala ọzọ dị ya nʼakụkụ, nke ga-adị kilomita iri na atọ nʼogologo, kilomita ise na ọkara nʼobosara ya, ga-abụ ebe obibi ndị Livayị, ndị na-arụ ọrụ nʼụlọnsọ ukwuu ahụ.

6“ ‘Nʼakụkụ obodo nsọ ka a ga-ekewapụta ala nke ogologo ya dị kilomita iri na atọ, nke obosara ya dịkwa kilomita abụọ na ọkara, nke a ga-abụ nke ndị Izrel.

7“ ‘A ga-ewepụta ala pụrụ iche maka nwa eze. Ala a ga-adị nʼakụkụ abụọ nke ala nsọ ahụ, na obodo ahụ. Ala a ga-agbatịrị site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ ebe oke ya dị ruo nʼosimiri Mediterenịa. Ọ ga-esitekwa nʼoke ala ya nʼọwụwa anyanwụ gbatịrị ruo nʼebe ebo Izrel nwere ala ha. Nʼụzọ dị otu a, ala a ga-aha ka ala ebo Izrel ketara. 8Ala a ga-abụrụ ya ihe nketa nʼIzrel. Ndịisi m agaghị emegbu ndị m ọzọ, ma ha ga-ahapụ ndị Izrel ka ha keta ala ndị a dịka ebo niile ha si dị.

9“ ‘Nke a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: O zuolara unu, unu ụmụ ndị eze Izrel. Kwụsịnụ ịpụnara ndị m ihe ha nwere nʼike, kpeenụ ikpe ziri ezi na-emekwa ihe kwesiri ekwesi. Kwụsịnụ ịchụpụ ndị m site nʼihe ha, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara. 10Ka ihe ọtụtụ unu ji ere ahịa unu bụrụ ezigbo efa na ezigbo baf
Otu ihe ọtụtụ bat na-erite galọọnụ isii
nke a na-ejighị aghụghọ kpụọ.
11Ka ihe ọtụtụ homa bụrụ ihe unu ga-eji na-atụ ihe niile, ma mmanụ, ma ọka. Ihe ọtụtụ ndị ọzọ unu ga-enwe ga-abụ efa, nke bụ otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka ọka. Nke ọzọ bụ baf, nke bụkwa otu ụzọ nʼụzọ iri nke homa, maka ịtụ ihe dịka mmanụ. 12Ihe ọtụtụ a ga-eji mata ịdị arọ nke ihe ọbụla ga-abụ shekel. Ihe a ga-eji gbanwere shekel a bụ iri gera abụọ naanị. Iri shekel isii ka a ga-ejikwa gbanwere otu mina.

Ịchụ aja na mmemme dị iche iche

13“ ‘Nke a bụ onyinye pụrụ iche unu ga-enye: otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa, site nʼotu homa nke ọka wiiti unu. Unu ga-enyekwa otu ụzọ nʼụzọ isii nke efa
Ihe ruru kilogram abụọ na ụma asaa
site nʼotu homa ọka balị unu.
14Dịka e nyere ya nʼiwu, unu ga-eji ihe ọtụtụ baf, weta mmanụ oliv bụ otu ụzọ nʼime ụzọ iri
Ya bụ lita abụọ na ụma abụọ
site nʼotu kọ ọbụla (kọ na-erita baf iri, nʼihi na baf iri, bụ ọtụtụ otu homa).
15Ọzọkwa, otu atụrụ nke sitere nʼigwe atụrụ dị narị atụrụ abụọ, nke si nʼebe ịta nri nke Izrel a gbara mmiri nke ọma ka unu ga-eweta. A ga-eji ndị a chụọ aja mkpụrụ ọka, na aja nsure ọkụ, na aja udo, maka ikpuchiri ndị wetara ha mmehie ha. Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya. 16Ndị niile nke nʼala ahụ ga-eso nwa eze Izrel bute onyinye ndị a. 17Nwa eze ahụ ka ọ dịrị iweta ihe eji achụ aja nsure ọkụ niile, aja mkpụrụ ọka, aja ihe ọṅụṅụ niile, na nke Ọnwa ọhụrụ nakwa nke ụbọchị izuike niile, nʼoge mmemme niile nke ndị Izrel. Ọ ga-ewetakwa ihe eji achụ aja mmehie, aja mkpụrụ ọka, aja nsure ọkụ, aja udo maka ikpuchiri ụmụ Izrel mmehie ha.

18“ ‘Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Nʼụbọchị mbụ nke ọnwa mbụ ọbụla, unu ga-ewere nwa oke ehi nke na-enweghị ntụpọ, chụọ aja ido ụlọnsọ m nsọ. 19Onye nchụaja ga-ewere ụfọdụ ọbara nke aja mmehie ahụ tee ya nʼakụkụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ m, na nʼakụkụ anọ nke ọnụ ebe ịchụ aja, na nʼahụ ibo nke ọnụ ụzọ ogige ime. 20Unu ga-emekwa otu ihe ahụ nʼabalị asaa nke ọnwa ahụ nʼihi onye ọbụla mehiere na-amaghị ama, maka ikpuchi mmehie metụtara ụlọnsọ m.

21“ ‘Nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa mbụ, ka unu ga-edebe Mmemme Ngabiga. Ọ ga-abụ mmemme abalị asaa. Nʼụbọchị ndị a, naanị achịcha nke a na-ejighị ihe na-eko achịcha mee ka unu ga-eri. 22Nʼụbọchị ahụ, onyeisi ga-eweta otu nwa oke ehi maka aja mmehie nke onwe ya, na maka mmehie mmadụ niile nke ala ahụ. 23Nʼụbọchị asaa nke mmemme ahụ, kwa ụbọchị, ọ ga-eweta oke ehi asaa na ebule asaa, ndị na-enweghị ntụpọ ọbụla, dịka ihe ịchụ aja nsure ọkụ nye Onyenwe anyị. Ọ ga-enyekwa nwa mkpi kwa ụbọchị maka aja mmehie. 24Ọ ga-ewetakwa nʼihi onyinye ịnata ihuọma, narị lita ọka anọ na iri itoolu,
Nha otu ọtụtụ efaf
nke bụ otu ọtụtụ otu oke ehi, otu ọtụtụ otu ebule. Tinyere lita mmanụ oliv atọ na ụma asatọ. Lita mmanụ atọ na ụma asatọ dịkwara otu efaf ọka.

25“ ‘Nʼoge mmemme ụbọchị asaa ahụ, nke ga-ebido nʼụbọchị iri na ise nke ọnwa asaa, ọ ga-ewetakwa ihe a ga-eji chụọ aja mmehie na aja nsure ọkụ, na aja mkpụrụ ọka, na mmanụ.

Copyright information for IboBIU